Psalms 107

Nchịkọta nke ise

Abụ Ọma 107–150

Ekele maka Chineke onye na-anapụta

1Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma;
ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

2Ka ndị niile Onyenwe anyị gbapụtara kwuo otu a,
ndị niile ọ gbapụtara site nʼaka onye kpọrọ ha asị,
3ndị ọ kpọlatara site nʼala niile dị iche iche,
site nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ, site nʼugwu na ndịda.

4Ụfọdụ wagharịrị nʼọzara, ala nke tọgbọrọ nʼefu,
ha enweghị ike ịchọta ụzọ nke ga-eduba ha nʼobodo ebe ha ga-ebi.
5Agụụ gụrụ ha, akpịrị kpọkwara ha nkụ,
olileanya gwụrụ ha nʼobi.
6Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị, nʼime nsogbu ha,
ọ napụtakwara ha site na mkpagbu ha niile.
7O duuru ha nʼụzọ ziri ezi
baa nʼobodo ha ga-ebi.
8Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ
na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ,
9nʼihi na o jirila ọtụtụ ezi ihe nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ
meekwa ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ṅụjuo afọ.

10Ụfọdụ nọdụrụ ala nʼọchịchịrị na nʼọnọdụ oke ihe mwute nke obi,
ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ na-ata ahụhụ ndị e ji mkpọrọ igwe kee ha agbụ,
11nʼihi na ha nupuru isi megide okwu niile nke Chineke
ma lelikwaa ndụmọdụ niile nke Onye kachasị ihe niile elu.
12Nʼihi ya, Chineke mere ka ha hụjuo anya site nʼịdọgbu onwe ha nʼọrụ,
ha sụrụ ngọngọ daa, ma ọ dịghị onye ọbụla nyeere ha aka ibilite ọtọ.
13Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha,
ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ha niile.
14O mere ka ha site nʼọchịchịrị na oke ihe mwute nke obi pụta.
O tijikwara agbụ ha niile.
15Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ
na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ,
16nʼihi na o tijisiela ọnụ ụzọ ama niile e ji bronz kpụọ
gbujiekwa mkpọrọ ịkpọchi ụzọ niile e ji igwe kpụọ.

17Ụfọdụ ghọrọ ndị nzuzu site na nnupu isi
taakwa ahụhụ nʼihi njehie ha niile.
18Ihe oriri ọbụla ghọọrọ ha ihe rụrụ arụ
ha bịakwara ọnụ ụzọ ama ọnwụ nso.
19Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha
ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ahụ niile.
20O zipụrụ okwu ọnụ ya, gwọọ ha;
ọ napụtara ha site nʼili.
21Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ
na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ.
22Ka ha chụọ aja ekele nye ya
jirikwa ọtụtụ abụ ọṅụ kwupụta banyere ọrụ ya niile.

23Ụfọdụ ji ụgbọ mmiri na-ejegharị nʼelu oke osimiri;
ha bụ ndị na-azụ ahịa ma na-ebugharịkwa ngwa ahịa nʼelu oke osimiri.
24Ha hụrụ ọrụ niile nke Onyenwe anyị,
ọtụtụ ọrụ ebube ya nʼogbu mmiri.
25Nʼihi na o kwuru okwu mere ka oke ifufe kuo
nke buliri ebili mmiri elu.
26Ha bụ ndị e buliri nnọọ ezigbo elu, ma budatakwa ruo ogbu mmiri niile;
nʼọnọdụ ihe egwu ahụ, obi lọrọ ha mmiri.
27Ha na-adagharị, na-aṅagharịkwa dịka ndị ṅụbigara mmanya oke.
Mmụta ha banyere ịnya ụgbọ mmiri adịghị enyekwara ha aka nʼoge dị otu a.
28Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha,
o mere ka ha pụta na mkpagbu ahụ niile.
29O mere ka oke ifufe dere duu;
o mekwara ka ebili mmiri nke oke osimiri dajụọ.
30Ha ṅụrịrị ọṅụ mgbe ọ dajụrụ,
o duuru ha ruo ebe ha na-aga nʼudo.
31Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ
na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ.
32Ka ha bulie ya elu nʼetiti ọgbakọ ukwu ụmụ mmadụ
ma tookwa ya na nzukọ ndị okenye.

33Ọ na-eme ka iyi ghọọ ọzara;
na-emekwa ka ebe mmiri si asọpụta ghọọ ala kpọrọ nkụ.
34Ọ na-eme ka ala na-amị mkpụrụ hiri nne ghọọ ọzara,
nʼihi ajọ omume nke ndị bi nʼime ya.
35Ọ na-eme ka ọzara ghọọ ala nke ọdọ mmiri jupụtara
mee ka ala akọrọ ghọọ isi iyi nke na-asọ asọ;
36ebe ahụ ka ọ kpọbatara ndị agụụ na-agụ ka ha biri,
ebe ahụ ka ha wuru obodo ebe ha ga-ebi.
37Ha ghara mkpụrụ nʼubi ha dị iche iche, kụọkwa ọtụtụ ubi vaịnị
ndị mịrị mkpụrụ dị ukwuu;
38ọ gọziri ha, ọnụọgụgụ ha bakwara ụba,
o mekwara ka anụ ụlọ ha mụbaa.

39Mgbe ahụ, ọnụọgụgụ ha adịghịkwa ka ọ dị na mbụ,
ha bụ ndị e ji mkpagbu na ihe ndakwasị na iru ụjụ wedata nʼala;
40onye ahụ na-eleda ndị na-achị achị anya
mere ka ha wagharịa nʼọzara, ebe ụzọ na-adịghị.
41Ma ọ na-anapụta ndị mkpa na-akpa site na nhụju anya ha,
mee ka ezinaụlọ ha mụbaa dịka igwe anụ ụlọ.
42Ndị ezi omume na-ahụ ya na-aṅụrị ọṅụ,
ma ndị ajọ omume na-emechi ọnụ ha nọọ duu.

43Onye ọbụla maara ihe ga-echezi echiche banyere ihe ndị a,
ma tuleekwa ọrụ ịhụnanya Onyenwe anyị nke dị ukwuu.
Copyright information for IboBIU